Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:27-34 Bible Nso (IGBOB)

27. Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

28. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye obodo a n'aka ndi Kaldea, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:

29. ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n'elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

30. N'ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n'anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n'ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

31. N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:

32. n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.

33. Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.

34. Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32