Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:13-30 Bible Nso (IGBOB)

13. M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si,

14. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

16. M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17. Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18. Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n'obi umu-ha gēsota ha n'azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19. I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20. Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'ala Ijipt, rue ta, ma n'etiti Israel ma n'etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

21. I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n'ala Ijipt puta;

22. I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;

23. ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n'iwu-Gi ka ha nējegharighi; n'ihe nile nke I nyere ha n'iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:

24. Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.

25. Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea.

26. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

27. Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

28. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye obodo a n'aka ndi Kaldea, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:

29. ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n'elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

30. N'ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n'anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n'ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32