Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 16:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si

2. I gaghi-alutara onwe-gi nwunye, i gaghi-enwe kwa umu-ndikom na umu-ndinyom n'ebe a.

3. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n'ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n'ala nka, si,

4. Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.

5. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.

6. Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:

7. agaghi-ekesara ha nri n'iru-újú, ikasi madu obi bayere onye nwuru anwu; agaghi-eme kwa ka ha ṅua iko nkasi-obi bayere nna madu ma-ọbu bayere nne madu.

8. Ọzọ, n'ulo nke oké oriri ka i nāgaghi-abà inọyere ha iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu.

9. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.

10. O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N'ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi?

11. I gāsi kwa ha, N'ihi na nna-unu-hà arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we jeso chi ọzọ di iche iche, fè ha, kpọ isi ala nye ha, ma Mu ka ha rapuru, ọ bu kwa iwum ka ha nēdebeghi;

12. unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 16