Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 14:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova nke ruru Jeremaia nti bayere okwu nb͕ochi miri-ozuzo.

2. Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n'ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.

3. Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

4. N'ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n'ihi na oké miri-ozuzo adighi n'ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha.

5. N'ihi na ọbuná nne-ele amuwo nwa n'ọhia, we rapu ya, n'ihi na ahihia ndu adighi.

6. Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n'isi, n'ihi na ihe-ọkukú adighi.

7. Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.

8. Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n'ìhi gini ka I di ka ọbìa n'ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?

9. N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.

10. Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.

11. Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha.

12. M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia.

13. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a.

14. Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 14