Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.