Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 43:4-19 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri:

5. ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia.

6. Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ?

7. Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?

8. Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi.

9. Mu onwem gānọrọ ya mbe; n'akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n'iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile:

10. n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia.

11. Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond:

12. were-kwa-nu ego okpukpu abua n'aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n'ọnu akpa-unu, weghachinu ya n'aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu:

13. kuru-kwa-nu nwa-nne-unu, bilie, jeghachikuru nwoke ahu:

14. Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.

15. Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n'aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n'Ijipt, guzo n'iru Josef.

16. Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie.

17. Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef.

18. Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi.

19. Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 43