Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie.