30. O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata.
31. Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.
32. Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ.
33. Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa.
34. Mb͕e Isọ nuru okwu nna-ya ndia, o tie oké nkpu di ilu nke-uku, si nna-ya, Gọziem, ọbuná mu onwem, nnam.
35. Ọ si, Nwa-nne-gi biara n'aghughọ, nara ngọzi-gi.
36. Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom?
37. Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n'aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m'nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m'gēmere gi, nwam?