1. Amam-ihe ewuwo ulo-ya,Ọ waputawo ogidi asa ya:
2. O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa;O dowo kwa table-ya n'usoro.
3. O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkùN'elu ebe nile di elu nke obodo, si,
4. Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya,
5. Bianu, rienu nrim ufọdu,Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa.
6. Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.
7. Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.
8. Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.
9. Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.
10. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.