Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 11:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu:Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.

20. Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu:Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.

21. Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ:Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.

22. Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì,Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di.

23. Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe:Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.

24. O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari;O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

25. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba:Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.

26. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya:Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.

27. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ:Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya.

28. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda:Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.

29. Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe:Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe.

30. Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu;Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.

31. Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa:Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 11