Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hagai 2:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n'irum; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n'ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu.

15. Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova:

16. na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di.

17. Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.

19. Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.

20. Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si,

21. Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu:

22. M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.

23. N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hagai 2