isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hagai 2 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu, okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

2. Biko, gwa Zerubabel nwa Shealtiel okwu, bú onye nāchi ala Juda, gwa kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, gwa kwa ndi Israel fọduru, si,

3. Ònye fọduru n'etiti unu nke huru ulo a n'ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n'anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n'anya-unu?

4. Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),

5. dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n'ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n'Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n'etiti unu: unu atula egwu.

6. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;

7. M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

8. Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

10. N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we si n'aka Hagai bú onye-amuma, bia, si

11. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Biko, jua ndi-nchu-àjà ajuju iwu, si,

12. Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è.

13. Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú.

14. Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n'irum; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n'ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu.

15. Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova:

16. na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di.

17. Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.

19. Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.

20. Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si,

21. Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu:

22. M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.

23. N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.