Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Habakuk 3:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala,N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.

13. I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,Izọputa onye-Gi etere manu;I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu,B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah

14. I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.

15. I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri,Bú obo nke ọtutu miri.

16. Anurum, afọm we ma jijiji,N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji:Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu,Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.

17. Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,Na ubi nile emeghi ihe-oriri;Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:

18. Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.

19. Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije.Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Habakuk 3