Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 10:11-27 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ.

12. Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.

13. Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n'èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n'ihi na ayi ejehiewo ri nne n'okwu a.

14. Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n'obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n'aru ayi laghachi.

15. Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.

16. Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.

17. Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu.

18. Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.

19. Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.

20. Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.

21. Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.

22. Na n'etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa.

23. Na n'etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza.

24. Na n'etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n'etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri.

25. Na n'etiti Israel: n'etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia.

26. Na n'etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija.

27. Na n'etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 10