Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 10:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n'ala n'iru ulo Chineke, esiri n'Israel chikọta n'ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n'ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne.

2. Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.

3. Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.

4. Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.

5. Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 10