Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 5:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n'onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n'isi-gi na n'afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n'onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu.

2. Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.

3. I gēweputa kwa n'ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, ke ha n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi.

4. Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n'etiti ọku ahu, sure ha n'ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile.

5. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n'etiti mba nile ka M'doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu.

6. O we nupu isi n'okpuru ikpém nile n'imebi iwu kari mba nile, na n'okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n'ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha.

7. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, ji si otú a: N'ihi na unu nātu ùzù kari mba nile nke di unu buruburu, unu we ghara ijeghari n'ukpurum nile, ghara kwa ime ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ bughi kwa dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo;

8. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile.

9. M'gēme kwa nime gi ihe ahu nke M'nēmeghi na mb͕e gara aga, nke M'nāgaghi-eme kwa ihe di ka ya ọzọ, n'ihi ihe-árú-gi nile.

10. N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.

11. N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 5