Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 44:8-14 Bible Nso (IGBOB)

8. Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu.

9. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n'obi nke anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, gābata n'ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n'etiti umu Israel.

10. Otú ọ di, ndi Livai ndi si n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n'ebe M'nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha.

11. Ma ha gābu ndi nēje ozi n'ebe nsọm, ndi-nlekọta n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n'ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n'iru ha ijere ha ozi.

12. N'ihi na ha nējere ha ozi n'iru arusi nile ha, we ghọrọ ulo Israel ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume; n'ihi nka ka M'weliri akam imegide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha gēbu kwa ajọ omume-ha.

13. Ma ha agaghi-abiakutem nso, iburum ndi-nchu-àjà, na ibiaru ihe nsọm nile nso, bú ihe nile di nsọ kachasi ihe nsọ nile: ma ha gēbu ọnọdu-ihere-ha, na ihe-árú nile ha nke ha meworo.

14. Ma M'gēme ha ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a, ifè òfùfè-ya nile, na ime ihe ọ bula nke agēme nime ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 44