Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 41:11-26 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku chere iru n'ebe ahu fọduru, otù ọnu-uzọ n'uzọ nke Ugwu, na otù ọnu-uzọ n'akuku Ndida: obosara nke ebe ahu nke fọduru di kwa cubit ise buruburu n'akuku nile.

12. Ma ulo ahu anēwu ewu nke di n'iru ebe ekewapuru ekewapu n'akuku n'uzọ Ọdida-anyanwu, obosara-ya di ọgu cubit atọ na iri; mb͕idi nke ulo ahu anēwu ewu di kwa cubit ise n'ib͕idi-ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di kwa ọgu cubit anọ na iri.

13. Ọ tù-kwa-ra ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise; na ebe ahu ekewapuru ekewapu, na ulo ahu anēwu ewu, na mb͕idi-ya nile, ogologo-ya di ọgu cubit ise;

14. na obosara nke iru ulo ahu, na nke ebe ahu ekewapuru ekewapu chere iru n'Iru-anyanwu, ọgu cubit ise.

15. Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n'azu ya, na ulo-njeghari-ya n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu;

16. nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;

17. rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha.

18. Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;

19. iru madu we che iru na nkwu ahu di n'otù akuku, iru nwa-ọdum che-kwa-ra iru na nkwu ahu nke di n'akuku nke-ọzọ: otú a ka emere ya n'ulo ahu nile buruburu n'akuku nile.

20. Site n'ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di.

21. Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n'ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n'ile ya anya.

22. Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.

23. Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n'otù n'otù.

24. Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.

25. Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí.

26. Window emechiri emechi na nkwu di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, n'akuku nile nke uzọ-nbata: otù a ka ulo ntà akuku nile nke ulo ahu na nbata-uzọ-ya nile di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 41