Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 41:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. O we me ka m'biarue ulo uku Chineke, o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya, cubit isi n'obosara n'otù akuku, na cubit isi n'obosara n'akuku nke-ọzọ, nka bu obosara ulo-ikwū ahu.

2. Obosara nke ọnu-uzọ di kwa cubit iri; akuku abua nke ọnu-uzọ ahu di kwa cubit ise n'otù akuku, na cubit ise n'akuku nke-ọzọ: O we tùa ogologo-ya, ọgu cubit abua, na obosara-ya, orú cubit.

3. O we ba nime, tùa akuku-ọnu-uzọ ọ bula nke ọnu-uzọ ahu, cubit abua: na ọnu-uzọ, cubit ise; na obosara ọnu-uzọ, cubit asa.

4. O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

5. O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n'otù n'otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.

6. Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.

7. Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti.

8. M'we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n'akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 41