Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 37:16-27 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù:

17. gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi.

18. Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ?

19. gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam.

20. Osisi abua ahu nke i nēde ihe n'elu ha gādi kwa n'aka-gi n'anya-ha.

21. Gwa kwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem ganāchiputa umu Israel n'etiti mba nile, ebe ha jere, M'gāchikọputa kwa ha n'akuku nile, me ka ha bata n'ala-ha:

22. M'gēme kwa ha otù mba n'ala-ha, n'ugwu nile nke Israel; otù eze gābu-kwa-ra ha nile eze: ha agaghi-abu kwa mba abua ọzọ, agaghi-ekera kwa ha ala-eze abua ọzọ ma-ọli:

23. ha agaghi-eji kwa arusi nile ha, ma-ọbu ihe-árú nile ha, ma-ọbu njehie nile ha, meru onwe-ha ọzọ: kama M'gāzọputa ha n'ebe-obibi nile ha, ebe ha mehieworo, M'gēme kwa ka ha di ọcha: ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.

24. Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha.

25. Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.

26. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

27. Ebe-obibim gādi kwa n'elu ha, M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 37