Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:30-33 Bible Nso (IGBOB)

30. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta.

31. Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.

32. Ma, le, i diri ha ka abù nke ihu-n'anya riri nne, dika onye nwere olu mara nma, nke nākpọ kwa ubọ nke-ọma: n'ihi na ha anuwo okwu-gi nile, ma ha adighi-eme ha.

33. Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme,) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n'etiti ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33