Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:22-32 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n'ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta.

25. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?

26. Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?

27. Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.

28. M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.

29. Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri ala-ha ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, n'ihi ihe-árú nile ha nke ha meworo.

30. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta.

31. Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.

32. Ma, le, i diri ha ka abù nke ihu-n'anya riri nne, dika onye nwere olu mara nma, nke nākpọ kwa ubọ nke-ọma: n'ihi na ha anuwo okwu-gi nile, ma ha adighi-eme ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33