Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 29:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n'elu mba nile: M'gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n'aru mba nile.

16. Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n'azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.

17. O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18. Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.

19. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.

20. Enyewom ya ala Ijipt ibu ihe ọ lutara n'ọlu, bú nke o fère òfùfè n'ihi ya, n'ihi na ha lurum ọlu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

21. N'ubọchi ahu ka M'gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M'gēnye nsaghe-ọnu n'etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 29