Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 27:7-22 Bible Nso (IGBOB)

7. Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.

8. Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.

9. Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.

10. Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.

11. Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.

12. Tashish bu onye-ahia-gi site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile.

13. Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.

14. Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile.

15. Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.

16. Siria bu Onye-ahia-gi site n'iba-uba nke ihe di iche iche i mere ire ere: emerald, na ákwà ododo, na ákwà akpara nke-ọma, na ezi ákwà ọcha, na coral, na ruby, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi nile.

17. Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.

18. Damaskọs bu onye-ahia-gi n'ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu.

19. Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n'etiti ihe-izu-ahia-gi.

20. Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.

21. Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.

22. Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 27