Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 12:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha.

8. Okwu Jehova we ruem nti n'ututu, si,

9. Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?

10. Si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye-isi nke nọ na Jerusalem ka eboro ibu a, ya na ulo Israel nile nke ndi ahu nọ n'etiti ha.

11. Si, Mu onwem bu ihe-ebube-unu: dika m'meworo, otú a ka agēme ha: ọ bu n'ime ka ha je biri n'ala ọzọ, n'idọta ha n'agha, ka ha gāla.

12. Onye-isi ahu kwa nke nọ n'etiti ha, n'ubu-ya ka o gēbu ihe n'ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n'ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu.

13. M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.

14. Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M'gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.

15. Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.

16. Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

17. Okwu Jehova we ruem nti, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 12