10. Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.
11. N'ihi na, le, Jehova nēnye iwu, Ọ gētipiasi kwa ulo uku, ọ bu kwa ulo ntà ka Ọ gētiwasi.
12. Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:
13. unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?