isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!

2. Gabiganu rue Kalne, hu; si-kwa-nu n'ebe ahu jerue Hemat nke bara uba: rida-kwa-nu rue Gat nke ndi Filistia: hà di nma kari ala-eze ndia? ma-ọbu ókè-ala-ha, ò riri nne kari ókè-ala-unu?

3. Unu ndi nāchupu ubọchi ọjọ, ma unu nēme ka ọnọdu ihe-ike bia nso:

4. ndi nēdina n'elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n'elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n'ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n'etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba;

5. ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche;

6. ndi nāṅu manya-vine n'ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n'ihi nkpaji akpajiri Josef.

7. N'ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n'ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya.

8. Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.

9. Ọ gēru kwa, na ọ buru na ndikom iri fọduru n'otù ulo, na ha gānwu.

10. Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.

11. N'ihi na, le, Jehova nēnye iwu, Ọ gētipiasi kwa ulo uku, ọ bu kwa ulo ntà ka Ọ gētiwasi.

12. Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:

13. unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?