Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 3:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Menu ka anuru ya n'elu ulo-elu nile n'Ashdod, na n'elu ulo-elu nile n'ala Ijipt, si, Zukọtanu n'elu ugwu nile nke Sameria, hu ọb͕ub͕a-aghara di ọtutu nke di n'etiti ya, na nmeb͕u di iche iche nke di nime ya.

10. N'ihi na ha amaghi ime ihe ziri ezi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nākpakọba ihe-ike na ipunara-madu-ihe n'ulo-elu nile ha.

11. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Onye-nkpab͕u gādi, ọbuná buruburu ala-gi: ọ gēme kwa ka ike-gi danari gi, agāluta kwa ulo-elu gi nile n'agha.

12. Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina.

13. Nurunu, b͕anu àmà imegide ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta.

14. N'ihi na n'ubọchi M'gēji njehie nile nke Israel leta ya, n'ubọchi ahu ka M'gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n'ala.

15. M'gēti kwa ma ulo mb͕e oyi ma ulo mb͕e okpom-ọku ihe; ulo nile nke ejiri ọdu wu gāla kwa n'iyì, ọtutu ulo gāgwusi kwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Emos 3