Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina.