Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 9:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha.

2. Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.

3. Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 9