Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 33:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.

10. Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

11. Jehova, gọzie àkù-ya,Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.

12. O kwuru ihe bayere Benjamin, si,Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya;O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.

13. Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.

14. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.

15. Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.

16. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya,Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà:Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef,Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.

17. Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 33