9. Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.
10. Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.
11. Jehova, gọzie àkù-ya,Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.
12. O kwuru ihe bayere Benjamin, si,Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya;O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.
13. Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.
14. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.
15. Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.
16. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya,Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà:Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef,Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
17. Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.