Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 33:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.

18. Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si,Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi;Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile.

19. Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu;N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume:N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara,Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá.

20. Ọ we kwue ihe bayere Gad, si,Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara:Dika nne-ọdum ka ọ nēbi,Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.

21. Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu,N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu;Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia,Ezi omume nke Jehova ka o mere,Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.

22. O we kwue ihe bayere Dan, si,Dan bu nwa ọdum,Ọ nēsi na Beshan maputa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 33