Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 7:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.

9. Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.

10. Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche.

11. Anọm nāhu na mb͕e ahu n'ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n'iyì, rara ya nye nsure-ọku.

12. Ma anu atọ nke fọduru, emere ka ọchichi-ha gabiga: ma ogologo mb͕e na ndu-ha ka enyere ha rue mb͕e akara àkà na mb͕e.

13. Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.

14. Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.

15. Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji.

16. Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:

17. Anu uku ndia, nke di anọ, bu eze anọ, ndi gēsi n'ala bilie ọtọ.

18. Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19. Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 7