isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 7 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.

2. Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike.

3. Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya.

4. Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.

5. Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.

6. Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n'azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi.

7. Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.

8. Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.

9. Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.

10. Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche.

11. Anọm nāhu na mb͕e ahu n'ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n'iyì, rara ya nye nsure-ọku.

12. Ma anu atọ nke fọduru, emere ka ọchichi-ha gabiga: ma ogologo mb͕e na ndu-ha ka enyere ha rue mb͕e akara àkà na mb͕e.

13. Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.

14. Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.

15. Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji.

16. Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:

17. Anu uku ndia, nke di anọ, bu eze anọ, ndi gēsi n'ala bilie ọtọ.

18. Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19. Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;

20. achọ-kwa-ram ima ihe bu ezi-okwu bayere mpi iri ahu nke di n'isi-ya, na mpi ọzọ ahu nke rigotara, nke mpi atọ da-kwa-ra n'ala n'iru ya; ọbuná mpi ahu nke nwere anya di iche iche na ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche, nke di uku kari ibe-ya nile n'ile ya anya.

21. Anọm nāhu, mpi ahu we nēbuso ndi nsọ agha, nwe ike imegide ha;

22. rue mb͕e Onye ochie ahu biara, mb͕e ọ di kwa ikpé enyere ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: mb͕e ahu akara àkà rute-kwa-ra na ndi nsọ nwere ala-eze ahu.

23. Otú a ka ọ siri, Anu nke-anọ gābu ala-eze nke-anọ n'uwa, nke gāpu iche n'ala-eze nile, ọ gēripia kwa uwa nka nile, zọpia ya, tapia ya.

24. Ma mpi iri ndia, ọ bu n'ala-eze ahu ka eze iri gēsi bilie: eze ọzọ gēbili kwa n'azu ha; ma ya onwe-ya gāpu iche n'aru ndi buru ya uzọ, eze atọ ka ọ gēme kwa ka ha di ala.

25. Ọzọ, okwu di iche iche megide Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka o gēkwu, ọ bu kwa ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ gēme ka ha ka nká: ọ gēle kwa anya ib͕anwe mb͕e di iche iche akara àkà na iwu; agēnye kwa ha n'aka-ya rue otù oge na oge abua na nkera oge.

26. Ma Onye-ikpe ahu gānọdu ala, ọ bu kwa ọchichi-ya ka agēme ka ọ gabiga, ikpochapu ya na ila ya n'iyì rue ọgwugwu ihe nile.

27. Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya.

28. N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.