Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 90:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. Tutu amuputa ugwu,Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi,Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.

3. I nēme ka madu laghachi n'ájá;I we si, Laghachinu, umu madu.

4. N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-GiDi ka nnyahuru mb͕e ọ nāga,Na dika otù nche n'abali.

5. I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu:N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.

6. N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó;N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.

7. N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi,Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji.

8. I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi,I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi.

9. N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi:Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume.

10. Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri;Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ,Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe;N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.

11. Ònye mara ike nke iwe-Gi,Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?

12. Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi,Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

13. Lata, Jehova; rùe ole mb͕e?Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi.

14. Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n'ututu;Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile.

15. Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha,Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha.

16. Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi,Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n'aru umu-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 90