Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 86:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Merem amara, Onye-nwe-ayi;N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.

4. Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.

5. N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie,I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.

6. Jehova, ge nti n'ekperem;Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile.

7. N'ubọchi nkpàm m'gākpọku Gi;N'ihi na I gāzam.

8. Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi;Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.

9. Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi;Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.

10. N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche:Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 86