Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 85:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.

2. I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah

3. I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.

4. Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.

5. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?

6. Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?

7. Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,Nye kwa ayi nzọputa-Gi.

8. M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu:N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo:Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.

9. Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya;Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.

10. Ebere na ezi-okwu ezutewo;Ezi omume na udo esutuwo ọnu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 85