Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 62:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.

7. N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.

8. Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri:Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah

9. Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu,ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu:N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe;Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.

10. Unu atukwasila obi na nmeb͕u,Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu:Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.

11. Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu,Ub͕ò abua ka m'nuworo nka;Na ike nile bu ihe Chineke nwere:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 62