Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 62:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du:N'aka-Ya ka nzọputam si bia.

2. Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.

3. Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu?Unu nētipia ya, unu nile,Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.

4. Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù;Okwu-ugha nātọ ha utọ:Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah

5. Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim;N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.

6. Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.

7. N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.

8. Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri:Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah

9. Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu,ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu:N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe;Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.

10. Unu atukwasila obi na nmeb͕u,Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu:Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.

11. Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu,Ub͕ò abua ka m'nuworo nka;Na ike nile bu ihe Chineke nwere:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 62