6. Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.
7. Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha:N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.
8. Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;I gākwa mba nile emò.
9. Ikem, Gi ka m'gēlezi anya:N'ihi na Chineke bu ulo-elum.
10. Chineke nke eberem gābia izutem:Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.
11. Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.
12. Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu;Ka anwude kwa ha nime npako-ha,Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.
13. Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,Rue nsọtu nile nke uwa. Selah
14. Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.