Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 107:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a,Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;

3. O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha,Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu,Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.

4. Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.

5. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.

6. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.

7. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi,Ijeru obodo obibi.

8. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

9. N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.

10. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;

11. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:

12. O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.

13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.

14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.

15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 107