Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 4:2-5 Bible Nso (IGBOB)

2. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.

3. Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu,Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma:Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi.

4. Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di,Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri,Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.

5. Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru,Nke nāta nri n'etiti urodi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 4