Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 1:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji,N'ihi na anyanwu achawom.Umu nke nnem wesaram iwe di ọku,Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile;Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.

7. Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya,Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie:N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

8. Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom,Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

9. Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala FeroKa m'wereworo gi tuara, gi eyìm.

10. Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa,Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.

11. Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi,Ya na nkpọchi ọla-ọcha.

12. Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu,Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.

13. Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum,N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

14. Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burumN'ubi-vine nke En-gedi.

15. Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma;Anya-gi abua di ka nduru.

16. Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ:Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.

17. Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar,Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 1