Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 2:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u,We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike:N'ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku.

5. Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel;O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike:O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.

6. Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n'ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige;O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà:Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion,O we ju eze na onye-nchu-àjà n'ọmuma nke iwe-Ya.

7. Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi,O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro:Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà.

8. Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion;O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo:O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo.

9. Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha:Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi;Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.

10. Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du;Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha:Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 2