Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 1:8-14 Bible Nso (IGBOB)

8. Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.

9. Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.

10. Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya,Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.

11. Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.

12. Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ?Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

13. N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha:Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu;O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.

14. Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 1