Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 1:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.

18. Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide:Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.

19. Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom,Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.

20. Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku:N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.

21. Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere;Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya:I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 1