Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 1:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.

12. Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ?Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

13. N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha:Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu;O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.

14. Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.

15. Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim:Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.

16. N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ;Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.

17. Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.

18. Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide:Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.

19. Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom,Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.

20. Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku:N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 1