Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 4:9-12 Bible Nso (IGBOB)

9. Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,

10. mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n'anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m'we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m'nyere ya bayere ozi ọma ahu.

11. M'gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n'ulo-ya n'elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m'gaghi-ajuta ọbara-ya n'aka-unu kpochapu unu n'uwa?

12. Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 4