mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n'anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m'we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m'nyere ya bayere ozi ọma ahu.