isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji.

2. Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n'umu Benjamin: (n'ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot:

3. ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n'ebe ahu rue ta.)

4. Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.

5. Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n'ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie.

6. Ma n'ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha.

7. Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile.

8. Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya.

9. Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,

10. mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n'anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m'we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m'nyere ya bayere ozi ọma ahu.

11. M'gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n'ulo-ya n'elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m'gaghi-ajuta ọbara-ya n'aka-unu kpochapu unu n'uwa?

12. Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.